Eze agbara agbaa egwu
Gbaa egwu, gbaa egwu.
Egwu mmuo
Egwu dike
Okorobia oma di ndu
Abuba ugo di ya n'isi
Na-efeghari n'ikuku.
Onu di ya n'obi
Uri di ya n'onu.
Nkwa di ya n'ukwu.
Dike mara mma nwoke
Ka o bu.
Akirika di na mmadu
Agbara ojoo
Ebube agu
Oke osisi
Oke mgborogwu
Dimkpa asato
N'otu mgbe ahu
Ya ewere olu ike
Olu oma na-ede ka une
Wee kpokuo Chukwu
Na agbara ala anyi
Bookmark/Search this post with: